Sunday, 30 December 2012

Proverb #650


Mmanya gbuwe Nwanyị, ọ dabara di ya.

The 'hooking up smart' website from which our image was culled discusses an article and some research findings, bordering around male promiscuity and female vulnerability. Well we used the picture. Our proverb means 'When a woman is drunk, usually her husband might take undue advantage' ...

Which is classic statement about what happens when the circumstances are such, that a position is compromised and the 'untoward' might happen.  Sorry about this portrayal ...

To balance means we might also post 'rude' photos of men - but they are literally everywhere these days.Which is classic statement about what happens when the circumstances are such, that a position is compromised and the 'untoward' might happen.  
Sorry about this depiction. ...
To balance means we must also post 'rude' photos of men - but they are literally everywhere these days.





Proverb Contributed by  Kelechi Isiodu, Umunjam, Mbieri.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #649


Azọchaa godi 'ani, azọw 'ute.

First the land, then the mat. Proper decent Igbo order.

Proverb Contributed by  Domike Isiodu, Umunjam, Mbieri.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #648


Egwu adịghị kwanụ atụ afọ obuta ụzụ. Mana nkwụcha abụghị kwa ụjọ.


Editorial

More complex speaking. This is the orator's craft or something a good writer might do. See Proverb #645 . Nogzi  weaves on an allied idea to keep company with another one which is also a proverb. One phrase and another one with an opposite idea. This juxtaposition of ideas may be used to argue a position in diplomatic exchanges. Mana nwkụcha abụghị kwa ụjọ = But to stand still and keep one's peace is not cowardice or fear.

Contributed By Nwoko Nogzi
.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #647


Ụkwa ruo oge ya ọdaa, mana onye ndidi na-eri azụ ukpo.


Editorial

This is some complex speaking. Readers or keen perusing of our proverbs will have noticed that Ụkwa ruo oge ya ọdaa is already a proverb in its own right and exists here on the roll. See Proverb #13 . What Nogzi has done is to add on another allied idea which is a proverb in its own right too. Onye ndidi na-eri azụ ukpo: is the the proverb classical that expresses the English equivalent about patient dogs and bones i.e The patient dog eats the fat bone; Ngozi's one ? The patient fisher (or simply patient man) eats the well rounded large fish.

Contributed By Nwoko Nogzi
.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #646


Onye buru Chi ya ụzọ gbawa ọgbagbuo onwe ya n'ọsọ

Contributed By Nwoko Ngozi
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Saturday, 29 December 2012

Proverb #645


Egwu adịghị atụkwanụ afo o buru ụzọ.


Editorial

There is a variant which goes in the by now familiar pattern of 'Ajụjụ ndị Igbo' : Egwu ọ na-atụ afọ o ji buru ụzọ.
That variant was given to to the project by Reverend Eugene Isiodu.

Contributed By Nwoko Ngọzị
.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #644


Onye biara ije nwe ụna.


Proverb contributed By Geoffrey Ofoegbu, Igboukwu, Anambara State.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.


Proverb #643


Tụtụ tụtụ ka eji atụtụju akpa.

Contributed By Mike Ajaegbo...
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #642


Onweghị ihe mebiri n'afọ ewu.

Contributed By Chinwe Anyanwụ Madukwe Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #641


Emeziere nwanyị ebe ọ na-asa ahụ,ya kwọọ miri zom! zom! zom!


Contributed By Chinwe Anyanwụ Madukwe Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Sunday, 23 December 2012

Proverb #640


Aṅụ sị na ihe kpatara ya ji eme mkpọtụ tupu ya abanye n'uji bụ ka anụ bi n'uji bido n'oge zọba isi onwe ya.” -

By Kelechi Isiodu.
Contributed By Kelechi Una Isiodu, Umunjam, Mbieri.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #639


"Agadi nwanyị daa ada ugboro abụọ, ọ gụọ ihe obu n'ukpo ọnụ."



Proverb contributed By Dubem Okoye, SA.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #638


Anaghi anọ ntịrị arụ ube ọnya.

Proverb contributed By Arthur Iwualla, Orodo, Mbaitoli.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #637


Echi di ime.




Contributed By Chioma Maryanne Nwabor Enugu Ukwu 
 

for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #636


Onye i kpọga oku azabeghị gị, i sị ya gbafukwaa n'ụkwụ?” -

-Ajụjụ ndị Igbo.

Proverb contributed By Ugochi Okorie-Nnadika,Umudi Nkwere LGA.

for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #635


Mgbe osisi nọ n'elu kugbuwere mmadụ onye ngịga atọrọ ngịga n'ihi na ngịga nwere ike ikugbu mmadụ.





Variants Supplied By

Ndupu onye Nze; Gave a meaning variant: Onye hụrụ mgbe ọkụkọ na-abọ nsị, ya biko chụpụ ya,
n'ihi ọ maghị ma ọ bụ ya ga-eri ụkwụ ya mbochi aga egbu ya.

Contributed By 
John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.


Proverb #634


Ife melụ nkapi isi isi, si ya n'ọkpụkpụ.



Proverb contributed By Obioma Ofoegbu, Igboukwu, Anambara State.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.


Proverb #633


“... Agwọ dị n'akịrịka.



Editorial

The giver of the proverb has produced a simple powerful idiomatic  piece of speech which our people use to
express in a proverb the sense of trouble. Simply means 'Here be trouble or There is trouble'. Literally the
picture is a poisonous snake crawling about meddling in one of our old thatched roofs ... powerful!!!


Contributed By Chioma Maryanne Nwabor Enugu Ukwu 
 

for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #632


Nwa mbe na-agba ọbara nga ọha.


Proverb contributed By: Agam. D Iheanyigwe, Ehime, Mbano
Variants By Kelechi Isiodu, Nwa nza na-agba ọbara nga ọha ...
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Proverb #631


Onye (na) enweghị ihe obu, anaghị akụwa ihe.


Editorial:
The giver of the proverb didn't give the bracketed sense - (na - that) ... The literal English: The person that has not carried a thing, a pot for instance, cannot break anything. The form of the sentence without 'na' - works just fine - a kind of attitudinal speaking.

Contributed By Chinwe Anyanwụ Madukwe
 Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Saturday, 22 December 2012

Proverb #630


Onye shị nanị ya biri chetakwa afọ nka ya.” 


Contributed By 
John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #629


Ụtara nwere isi nwee ọdụ, onye mbihe bihere ya.

Contributed By Chinwe Anyanwụ Madukwe Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #628


Mmiri dọrọ n'okpokoro eju(la) dọrọ ele nwankịta.




Contributed By Chinwe Anyanwụ Madukwe Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #627


Ibi sị na ya bụ agbụrụ , onye ya bịara nga ya , ya lezie ya anya, maka na ya anaghị aga ebe nile.




Contributed By Chinwe Anyanwụ Madukwe Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #626


Ụzọ dị mma, agaa ya ugboro abụọ.









Contributed By Bob Oji, Ụmụahịa
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Friday, 21 December 2012

Proverb #625


Dupum wụ ururo (urere) onwụụ (ọ wụ-ghị) sha amaghị m ụzo m shi ala.” - Okwu nde Owere



Variants Supplied By

Chinwe Anyanwụ Madụkwe :  Dufum alaa wu ururo, o nweghị onye amaghị ụzọ o siri bịa.
Agam D. Iheanyịigwe : Dulagam wụ ure, o nweghị onye na-amaghị ala nna ya.

Contributed By 
John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #624


Mbieri shị eriluo anụ ejiri azụ kwụọ ụgwọ ya.






Contributed By John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #623


Enwe shị na onye ya ga-agọrọ agọọ wụ nwa ya bu n'afọ, ma nke ọ kwọ n'azụ, na ya amaghị mgbe ọ ga-aghọrọ ụtụ raa.






Contributed By John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #622


Onye regburu onwe ya jikwa aka ya nara.






Contributed By John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #621


Onye rimere ọhụrụ, chefuo ochie ya enyekwalam.

 

Contributed By John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Tuesday, 20 November 2012

Proverb #620


Ọkpọmbara shị kama ishi ya ga atọ n'ite ka ikwukwe ọsọ kweya.




Proverb contributed By John Isiodu, Umunjam, Mbieri.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Monday, 19 November 2012

Proverb #619


Ekele gafee nkọlọ aka ya aghọọ mkpụrụ.







Proverb Contributed By Agam D Iheanyịgwe, Ehime Mbanọ.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #618


Nwata sị na Nne ya agaghị ehi ụra, ya-nwa agaghịkwa ehi ụra.







Proverb contributed By Obioma Ofoegbu, Igboukwu, Anambara State.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.


Proverb #617


Gi jide onye ohi, ya sị taa bụ ya mbụ.

- ilu nde Ngwa






Proverb by Kelechi Isiodu, Umunjam, Mbieri.
For iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #616


Onye ụlọ ya gbaga ọkụ anaghị achụ oke.





Proverb by Kelechi Isiodu, Umunjam, Mbieri.
For iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Friday, 28 September 2012

Proverb #615


Ajuju: Kedu ka eke si anya anwụ? Aziza: Ntụgharị ntụgharị.

-ajụjụ na azịza ndị Igbo



Proverb contributed By Obioma Ofoegbu, Igbo Ukwu.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Proverb #614


Agwọ ahụ anyị gburu, ọ rị mkpirishi ole?

-ajụjụ ndị Igbo






By Kelechi Isiodu.
Contributed By Kelechi Una Isiodu, Umunjam, Mbieri.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #613


Amaa nwata ajọ nkwụkwa, ajọ okwu apụọ ya ọnụ.






Chinwe Anyanwụ Madukwe, Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Proverb #612


Ejila apala onye jega ubi abọ.








Chinwe Anyanwụ Madukwe, Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Proverb #611


Ụdara dachịrị ụzọ, mpịwa na-agụ ya.






Chinwe Anyanwụ Madukwe, Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Proverb #610


Nkpọrọghịghị adịghị nma na ọgọm nwanyị.





Chinwe Anyanwụ Madukwe, Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here


Proverb #609


Anaghị ata ọkpa nshịkọ na nwari.







Contributed By John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #608


Anaghị agba aka achụ ụkpara.






Contributed By John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #607


Onye dinyere nwata jide nkapị [ga-][e]-nyekwa ya mmiri oji akwọ aka

Contributed By John Isiodu, Mbieri
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #606


Ma okenye a nọghị nso, ụmụntakịrị ahụọ ada taa, sị na ha tara apa.





Proverb contributed By Uzoma Nwaekpe [Odengalasi], Amachi-Nsulu Isialangwa.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here.

Proverb #605


A¬gbaghị izu jee ịgba nta egbue anụ na enweghị aha







Proverb contributed By John Isiodu, Umunjam, Mbieri.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Proverb #604


Ụbọchị ọma na-eji ụtụtụ wara anwụ.





Contributed by Ezinne Athan Lizzy, onye []
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Proverb #603


Nwaanyị mụta ite ofe mmiri mmiri, di ya amụta ịpị ụtara aka were suru
ofe.




Proverb contributed By Obioma Ofoegbu, Igbo Ukwu.
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Wednesday, 19 September 2012

Proverb #602


Aka ekpe ka ndụ na otula





Chinwe Anyanwụ Madukwe, Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Tuesday, 18 September 2012

Proverb #601


Agwọ na ihe o loro agwọtọrọla.





Chinwe Anyanwụ Madukwe, Onye Owerre zone, Ngor Okpala L.G.A
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here

Sunday, 16 September 2012

Project Milestone - For past the 600th Proverb - milestone ...


An Igbo Poem and Prayer ... by Maazi Nnaemeka Callistus Ezaka


ỌJỊ ABỊA

Chineke nna, Chukwu abiama
O bi n'elu ebube ya na-akpụ n'ala
Jeso Kristi, onye nzọpụta nke ụwa
Gi onye rigoro n'elu osisi ghọtara anyị nzọpụta
Mmụọnsọ, gị onye na-eduba mmadụ n'ozuzuoke eziokwu
Bịanụ taara anyị ọjị

O kwa unu ato nwe mmadu?
Ya ka anyi ji akpoku unu
Maka na onye e-ji ihe n'aka a-kpo oku
Nwere nke o na-eme
Oji buru: a gbanwoo dike n'izu
Agbagharia ya

Igbo chiri nze, chie ozo kwuru si
Onye wetara oji, wetara ndu
E wetala m ọjị
Ya bụ na ndụ abịala
Mana e-were uche gbaa ogige, Chukwu nna
Aghota na sọ gị na-enye ndu

Chukwu abiama nara m ọjị
Maka na nwanyi oluoma, di ya anaghị ajụrụ ya nri
Ihe ọjọọ a-bịakwasịkwala anyị
Ka anyị nwee ike maa mma, dị ka ugo
Nnunu e-ji abuba ya e-chi ọzọ
Maka na ehi maa mma, e were mpi ya ñuo mmanya

Chukwu abiama nara m ọjị
Maka na ejide oji n'aka, e-sedo ala, sedo ụmụmmụọ aka na ntị
Chukwu abiama nara m ọjị taa
Sọ gị ka anyị ga-enye tupu anyi ataa
N'etiti chi ndị ọzọ n'iile, sọ nke gi ka anyi kwere
Maka na ahịhịa juru ọhịa, ma a baa ọhia, a-kpara ọkazị

Chukwu abiama bịa taara anyị ọjị
Ndi eluigwe n'iile bia taara anyị ọjị
Anyị agaghị eri ghara inye unu
Maka na onye riwe chezọọ chi ya
Ihe ukwu bịa, o tie mkpu sị
Chi m egbue m-oo!

Ọfọ anyị bụ
Ka anyị ghara iji anya anyị hụ ihe ọjọọ
Ka anyị gharakwa i-che ya n'echiche
Maka na onye tụọ aka na nsị tụọ n'ọnụ
Onye ahụ e-riela nsị
Maka na onye tara amụ ebule, ji ibi ụgwọ

Ọbịara be anyi abịagbukwala anyị
Ọ lawa be ya, ukwu e-jila ya
Nwa mmụọ emegbukwala nwa mmadu
Ka nwa mmadu ghara imegbu nwa mmụọ
Anyị kpọọ oriri, ndi eluigwe biakwara anyị ya
Maka na ahụ ada, hụ ebe, a mara na ndi mkpụmkpụ e-zuola
Onye biri, ibe ya biri
Mmiri atala, azụ anwụla
Egbe bere, ugo bere
Nke si ibe ya ebela, nku kwaa ya
Ka ama akịdị gbaa na nsị
Ndi na-arụ ụka a-mara na ọfọ dị ire

Chukwu abiama nara m ọjị taa
Ka ọ hara m etua n'ọnụ
Maka na onye gọkarịa ọfọ
Ọ gwa ndị mmụọ ebe obi ya dị
Ọfọ ndị a, na nke ogologo ndụ ka anyị gọro, sị ya ree
Iseeee!


Maazi Nnaemeka Ezaka
Abakaliki, Nov. 2009


Editorial:

It is always a special thing - the presentation and blessing of the Kolanut ...
We ndị Igbo like the five-way auspicious Kola-nut (Isee !!!), but when we don't find it, :-)
the blessing and presentation of whatever we do find, with our gods attending, suffices ...

Let Maazi Nnaemeka talk about his inspiration(s) for this excellent poem interspersed
in places with the precious, lovely proverbs of ndí Igbo ...

[Nnaemeka's comment] >>

Ndi Igbo kwenyere na 'Eke kere uwa'--Chukwu [okike]. Ha na-asopuru, ma na-ekpere ya. Na i-me nke a, ndi Igbo na-adabere na Chukwu, maka otutu ihe: bido n'ihe di mfe n'anya--dika ihe a ga-eri--ruo n'ihe siri oke ike--dika idi/i-nye ndu. Na onodu a, anyi bu ndi Igbo--ndi ñujuru ara afo--anaghi eri, ma o bu jee, chezoo Chi anyi. N'ututu obula, ma o bu na mbido mmemme/ihe obula, Onye Igbo ga-/na-ekpe ekpere, kpokuo 'ahughi n'ije, ma ike agaghi' bu Chukwu [ndi Igbo nwere otutu aha ha na-etu ya]. I-kpe ekpere a, na i-go oji, maa i-go ofo [ma a si m kwuo], bu otu ihe. Ihe itunanya, i-ma mma, na ihe omimi di na ka anyi si a-go oji a, tinyere ihe anyi na-ekwugasi--di ka ebumnobi anyi--ma anyi na-ago ofo/oji; ihe ndi a niile, bu mkpalite mmuo m, n'i-de OJI ABIA.


The photo is one of the posters making the rounds on Facebook for nd ị Igbo.
It was made by Bob Oji [Admin] IgF&T ...

Maazi's Poem is your 600th Proverb Milestone at 60% of the way.

Poem/Proverbs contributed By  Maazị Nnaemeka Callistus Ezaka, 
for iFaT at ifont@groups.facebook.com
e-Mail: ifont.groups.facebook@gmail.com
© ifont 2011, as it appears here